9Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ?
10Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.
11O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.
12Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.
13Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.