7oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,
8oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo.
9Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ?
10Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.
11O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.