16Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ, na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara, nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya.
17A gwara m onwe m, “Chineke ga-ekpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.”
18Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ.
19Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu.
20Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi.