Ekiliziastis 3

A gwara m onwe m, “Chineke ga-ekpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.”

Ecclesiastes 3:17 (UKJV) I said in mine heart, God shall judge the righteous and the wicked: for there is a time there for every purpose and for every work.

15Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie, ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ. Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ.

16Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ, na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara, nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya.

17A gwara m onwe m, “Chineke ga-ekpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.”

18Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ.

19Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.