Ekiliziastis 4

Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?

Ecclesiastes 4:11 (UKJV) Again, if two lie together, then they have heat: but how can one be warm alone?

9Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:

10Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.

11Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?

12Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.

13Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.