1Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ.
2Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị, maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu. Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe ma naanị nʼụwa ka ị nọ, nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole.
3Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ, otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ.
4Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke.
5Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya.