Ekiliziastis 6

Ihe eji anya hụ ka mma karịa oke ọchịchọ! Nke a bụkwa ihe efu na ịchụso ifufe.

Ecclesiastes 6:9 (UKJV) Better is the sight of the eyes than the wandering of the desire: this is also vanity and vexation of spirit.

7Ndọgbu niile mmadụ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ bụ ka o rijuo afọ, ma o nweghị onye na-enweta ihe na-ezuru ya.

8Olee ụzọ onye maara ihe si dị mma karịa onye nzuzu? Gịnị bụ uru dịịrị onye ogbenye na ọ maara otu e si akpa ezi agwa nʼihu ndị dị ndụ?

9Ihe eji anya hụ ka mma karịa oke ọchịchọ! Nke a bụkwa ihe efu na ịchụso ifufe.

10Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga. Amakwaara ihe mmadụ bụ, mmadụ ọbụla apụghị ịlụso onye ka ya ike ọgụ.

11Okwu na-aba ụba, nghọta na-adị nta. O nwere uru nke a bara?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.