7Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ibe ya ihe gaje ime?
8Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ mgbe ọ chọrọ. Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya. Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha, otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ.
9Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu.
10Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu.
11Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie.