8nke o mere ka ọ babigara anyị ụba oke site nʼamamihe na nghọta niile.
9O meela ka anyị mata ihe omimi nzube ya, dị ka o si tọọ ya ụtọ, bụ ihe omimi o zubere ime nʼime Kraịst.
10Nke ọ ga-eme ka o mezuo mgbe oge ya niile zuru, nke bụ ịchịkọta ihe niile nʼime ya, bụ ihe ndị dị nʼeluigwe na nʼụwa nʼokpuru Kraịst.
11Nʼime Kraịst ka e mere anyị ndị nketa, ndị e bururị ụzọ họpụta na mbụ, dị ka atụmatụ onye ahụ na-arụpụta ihe niile nʼizuoke nke nzube na ebumnuche ya.
12Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya.