6Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya.
7Nʼime ya, anyị nwere mgbapụta site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị,
8nke o mere ka ọ babigara anyị ụba oke site nʼamamihe na nghọta niile.
9O meela ka anyị mata ihe omimi nzube ya, dị ka o si tọọ ya ụtọ, bụ ihe omimi o zubere ime nʼime Kraịst.
10Nke ọ ga-eme ka o mezuo mgbe oge ya niile zuru, nke bụ ịchịkọta ihe niile nʼime ya, bụ ihe ndị dị nʼeluigwe na nʼụwa nʼokpuru Kraịst.