4Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya.
5O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime.
6Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya.
7Nʼime ya, anyị nwere mgbapụta site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị,
8nke o mere ka ọ babigara anyị ụba oke site nʼamamihe na nghọta niile.