12Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya.
13Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ.
14Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya.
15Nʼihi nke a, ebe m nụrụ akụkọ banyere okwukwe unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa maka ịhụnanya unu nwere nʼebe ndị nsọ niile nọ,
16esepụghị m aka ikele ekele nʼihi unu, mgbe niile m na-echeta unu nʼekpere m niile.