8Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke.
9O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi.
10Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.
11Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na “ndị e biri ugwu” na-akpọkwa unu “ndị a na-ebighị ugwu” (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie).
12Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa.