Ndị Efesọs 2

O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi.

Ephesians 2:9 (UKJV) Not of works, lest any man should boast.

7O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs.

8Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke.

9O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi.

10Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.

11Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na “ndị e biri ugwu” na-akpọkwa unu “ndị a na-ebighị ugwu” (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.