9meekwa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmatụ nke ihe omimi e zoro nʼime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ.
10Ka ọ ga-abụ site na chọọchị, a ga-eme ka amamihe Chineke nʼụdị dị iche iche bụrụ ihe ọchịchị na ikike niile dị nʼeluigwe ga-amata.
11Nke a bụ nʼusoro nke atụmatụ ya dị ebighị ebi, nke e mezuru nʼime Jisọs Kraịst Onyenwe anyị,
12bụ onye anyị nwere ntụkwasị obi na obi siri ike ịbịakwute site nʼokwukwe anyị nwere na ya.
13Nʼihi nke a, arịọ m ka unu ghara ịda mba maka mkpagbu m nʼihi unu, ha bụ otuto nye unu.