Ndị Efesọs 3

Nʼihi nʼezie, unu anụla banyere nlekọta nke amara Chineke ahụ nke e nyere m maka ọdịmma unu.

Ephesians 3:2 (UKJV) If all of you have heard of the dispensation of the grace of God which is given me toward you:

1Ọ bụ nʼihi nke a ka mụ onwe m bụ Pọl bụ onye mkpọrọ nke Jisọs Kraịst maka unu ndị mba ọzọ.

2Nʼihi nʼezie, unu anụla banyere nlekọta nke amara Chineke ahụ nke e nyere m maka ọdịmma unu.

3Otu e si kpughee nzube nzuzo ya niile nye m, dị ka m gwara unu ihe banyere ya nʼokwu dị nta nʼakwụkwọ ozi ahụ m detara unu.

4Ọ bụrụkwa na unu agụọ akwụkwọ ahụ m deere, unu ga-aghọta ihe m maara banyere ihe omimi Kraịst.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.