5Nke a e meghị ka ụmụ mmadụ mara nʼọgbọ gara aga dị ka Mmụọ Nsọ siri kpugheere ya ndị ozi na ndị amụma ya dị nsọ ugbu a.
6Otu a ka ndị mba ọzọ si soro bụrụ ndị nketa, ndị ga-abụ otu anụ ahụ na ndị ga-eketa nkwa ahụ nʼime Jisọs Kraịst site nʼoziọma.
7E mere m ka m bụrụ onyeozi nke oziọma a, dịka onyinye amara nke Chineke si dị, bụ nke e nyere m site nʼịrụ ọrụ nke ike ya.
8Ọ bụ ezie na mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nʼetiti ndị nsọ niile, e nyere m amara nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ nke enweghị atụ nke juru nʼime Kraịst,
9meekwa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmatụ nke ihe omimi e zoro nʼime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ.