9(E kwuru, “Ọ rigoro,” gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buru ụzọ rịdaa nʼime ala mmụọ?
10Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.)
11O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi.
12Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst;
13tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst.