Ndị Efesọs 4

Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ.

Ephesians 4:3 (UKJV) Endeavouring to keep the unity of the Spirit in the bond of peace.

1Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu.

2Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya.

3Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ.

4E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu.

5Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.