Ndị Efesọs 5

Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya.

Ephesians 5:30 (UKJV) For we are members of his body, of his flesh, and of his bones.

28Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya.

29Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị.

30Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya.

31“Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”

32Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.