29Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị.
30Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya.
31“Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”
32Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya.
33Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.