7Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị mmadụ.
8Nʼihi na unu maara na Onyenwe anyị ga-akwụghachi onye ọbụla maka ihe ọma ọbụla ha mere, ma ha bụ ohu maọbụ ndị nweere onwe ha.
9Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nʼụzọ dị otu a. Abarala ha mba, nʼihi na ị matara na unu nwere naanị otu Nna ukwu nọ nʼeluigwe. Ile mmadụ anya nʼihu adịghịkwa nʼebe ọ nọ.
10Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu.
11Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu.