11sị ha gaa kpọọ Vashti nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka Vashti kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na Vashti mara mma.
12Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ Vashti jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu.
13Dịka eze Sekses na-eme, ọ kpọkwara ndị ọkachamara nʼihe gbasara iwu na ikpe ziri ezi. Eze na ndị a mara ihe, bụ ndị maara ihe ụbọchị nyere kparịtara ụka.
14Ha bụkwa ndị na-anọkarị eze nso. Aha ha bụ Kashena, na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan. A maara aha mmadụ asaa ndị a nʼala Midia na Peshịa. Ha bụ ndị na-aga nʼihu eze mgbe ọbụla ha chọrọ, bụrụkwa ndị dịkarịsịrị elu nʼalaeze ahụ.
15Eze jụrụ sị, “Dịka iwu si dị, gịnị ka a ga-eme Vashti bụ nwunye eze nʼihi na o nupuru isi nʼiwu eze Sekses nyere nke o zigaara ya site nʼọnụ ndị onozi ya?”