13Dịka eze Sekses na-eme, ọ kpọkwara ndị ọkachamara nʼihe gbasara iwu na ikpe ziri ezi. Eze na ndị a mara ihe, bụ ndị maara ihe ụbọchị nyere kparịtara ụka.
14Ha bụkwa ndị na-anọkarị eze nso. Aha ha bụ Kashena, na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan. A maara aha mmadụ asaa ndị a nʼala Midia na Peshịa. Ha bụ ndị na-aga nʼihu eze mgbe ọbụla ha chọrọ, bụrụkwa ndị dịkarịsịrị elu nʼalaeze ahụ.
15Eze jụrụ sị, “Dịka iwu si dị, gịnị ka a ga-eme Vashti bụ nwunye eze nʼihi na o nupuru isi nʼiwu eze Sekses nyere nke o zigaara ya site nʼọnụ ndị onozi ya?”
16Memukan kwuchitere ọnụ ndị ọzọ sị, “Ihe Vashti nwunye eze mere jọrọ njọ. O mehiela eze, mehiekwa ndị ọchịchị niile, na ndị niile bi nʼakụkụ niile nke alaeze Sekses.
17Nʼihi na ndị inyom niile ga-amata ihe eze nwanyị mere, malite ilelị ndị di ha anya, ma na-ekwu sị, ‘Eze Sekses nyere Vashti nwunye ya iwu ka ọ bịa nʼihu ya, ma ọ jụrụ ịbịa.’