1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ka iwe eze Ahasuerọs dajụrụ, ọ malitere iche echiche banyere Vashti. O chetara ihe Vashti mere, chetakwa ihe e kpebiri banyere ya.
2Mgbe ahụ, ndị na-ejere eze ozi sịrị ya, “Ka anyị gaa chọtara eze ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke mara mma ile anya.
3Ka eze họpụta ndị nchịkọta nʼisi obodo niile, ndị ga na-ahọpụta, ma na-akpọbatakwa ụmụ agbọghọ ndị a niile mara mma, nʼụlọeze dị na Susa. Ka Hegai, onozi eze bụrụkwa onye ga-elekọta ndị inyom ndị a. Ka e jirikwa ihe ịchọ mma niile chọọ ha mma dịka o si kwesi.