Esta 2

Eze kpọrọ oke oriri, nʼihi Esta, nye ndịisi ọchịchị ya niile na ndị ozi ya niile. Ọ kpọsara ezumike nye ndị ọrụ niile nʼalaeze ya, ma kesaakwa onyinye nye ọtụtụ ndị mmadụ dịka eze pụrụ ime.

Esther 2:18 (UKJV) Then the king made a great feast unto all his princes and his servants, even Esther's feast; and he made a release to the provinces, and gave gifts, according to the state of the king.

16E mere ka Esta bakwuru eze nʼọnwa nke iri nʼafọ nke asaa nke ọchịchị eze Ahasuerọs.

17Eze hụrụ Esta nʼanya karịa ụmụ agbọghọ ndị ọzọ niile. Ọ natara amara na mmasị eze karịa ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị ọzọ. Ya mere, o weere okpueze kpukwasị ya nʼisi mee ya eze nwanyị nʼọnọdụ Vashti.

18Eze kpọrọ oke oriri, nʼihi Esta, nye ndịisi ọchịchị ya niile na ndị ozi ya niile. Ọ kpọsara ezumike nye ndị ọrụ niile nʼalaeze ya, ma kesaakwa onyinye nye ọtụtụ ndị mmadụ dịka eze pụrụ ime.

19Mgbe a chịkọtara ụmụ agbọghọ ndị a na-amaghị nwoke nke ugboro abụọ, Mọdekai nọ ala nʼọnụ ụzọ ama eze.

20Ma Esta emebeghị ka onye ọbụla mara ihe banyere ezinaụlọ ya maọbụ obodo ya, dịka Mọdekai nyere ya nʼiwu, nke ọ na-emeri mgbe a na-azụlite ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.