20Ma Esta emebeghị ka onye ọbụla mara ihe banyere ezinaụlọ ya maọbụ obodo ya, dịka Mọdekai nyere ya nʼiwu, nke ọ na-emeri mgbe a na-azụlite ya.
21Otu ụbọchị, mgbe Mọdekai nọ nʼọrụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọ ukwu eze, ndị onozi abụọ eze nwere, aha ha bụ Bigtan na Teresh, ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọeze nche, were iwe megide eze. Ha gbara izu kpebie na ha ga-egbu eze Sekses.
22Ma Mọdekai chọpụtara nzube ọjọọ a gwa ya Esta, nwunye eze, onye gwara eze, meekwa ka eze mata na ọ bụ Mọdekai gwara ya.
23Mgbe e nyochara kwu a, chọpụta na ọ bụ eziokwu, e jidere mmadụ abụọ ahụ kwụgbuo ha nʼosisi. E dekwara ihe ndị a niile nʼihu eze nʼime akwụkwọ akụkọ ihe e mere.