19Mgbe a chịkọtara ụmụ agbọghọ ndị a na-amaghị nwoke nke ugboro abụọ, Mọdekai nọ ala nʼọnụ ụzọ ama eze.
20Ma Esta emebeghị ka onye ọbụla mara ihe banyere ezinaụlọ ya maọbụ obodo ya, dịka Mọdekai nyere ya nʼiwu, nke ọ na-emeri mgbe a na-azụlite ya.
21Otu ụbọchị, mgbe Mọdekai nọ nʼọrụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọ ukwu eze, ndị onozi abụọ eze nwere, aha ha bụ Bigtan na Teresh, ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọeze nche, were iwe megide eze. Ha gbara izu kpebie na ha ga-egbu eze Sekses.
22Ma Mọdekai chọpụtara nzube ọjọọ a gwa ya Esta, nwunye eze, onye gwara eze, meekwa ka eze mata na ọ bụ Mọdekai gwara ya.
23Mgbe e nyochara kwu a, chọpụta na ọ bụ eziokwu, e jidere mmadụ abụọ ahụ kwụgbuo ha nʼosisi. E dekwara ihe ndị a niile nʼihu eze nʼime akwụkwọ akụkọ ihe e mere.