Esta 3

Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze bụ Ahasuerọs mere Heman nwa Hamedata onye Agag ka ọ bụrụ onye ukwu, o nyere ya ugwu site nʼinye ya oche dị elu karịa nke ndị ọzọ niile a na-asọpụrụ.

Esther 3:1 (UKJV) After these things did king Ahasuerus promote Haman the son of Hammedatha the Agagite, and advanced him, and set his seat above all the princes that were with him.

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze bụ Ahasuerọs mere Heman nwa Hamedata onye Agag ka ọ bụrụ onye ukwu, o nyere ya ugwu site nʼinye ya oche dị elu karịa nke ndị ọzọ niile a na-asọpụrụ.

2Ndịisi ọchịchị eze niile na-egbu ikpere nʼala nye Heman nsọpụrụ mgbe ọbụla o si nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze na-agafe, nʼihi na ọ bụ otu a ka eze nyere nʼiwu. Ma Mọdekai ekweghị egbu ikpere nye ya, ọ kwekwaghị enye ya nsọpụrụ.

3Mgbe ahụ, ndị ozi eze ndị nọ nʼọnụ ụzọ ama eze jụrụ Mọdekai ajụjụ si ya, “Gịnị mere i ji na-enupu isi nʼiwu eze nyere?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.