10Ya mere, eze gbapụtara ọlaaka ikike ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Agag, onye iro ndị Juu
11Eze gwara Heman, “Enyela m gị ọlaọcha ahụ, ya na ndị a. Mee ha dịka o si dị gị mma.”
12Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa mbụ, a kpọkọrọ ndị ode akwụkwọ eze niile. Ha depụtara nʼakwụkwọ isi obodo dị iche iche, nakwa nʼasụsụ ndị ọbụla, ihe niile Heman nyere nʼiwu nye ndị nnọchị anya eze niile, ndị ọchịchị nke ala niile ha na-achị, na ndịisi nke ndị ọbụla nọ nʼime alaeze a. E ji aha Ahasuerọs dee akwụkwọ ndị ahụ, werekwa mgbaaka eze nʼonwe ya kaa ya akara.
13E zipụrụ ndị ọgba ọsọ ozi eze ka ha gaa nʼisi obodo ọbụla nʼalaeze ahụ, na-enye iwu a edere nʼakwụkwọ ka a laa nʼiyi, gbuo, ma kpochapụkwa ndị Juu niile, ma nwantakịrị ma okenye, ma nwanyị, ma ụmụntakịrị, nʼotu ụbọchị, nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada, nakwa ịpụnara ha akụnụba ha nʼike.
14Ihe ndepụta nke otu akwụkwọ ahụ bụ nke a ga-enye dịka iwu nʼobodo niile ọbụla site na nkwupụta, mee ka ndị mba niile mara maka ya, nọọkwa na njikere nʼihi ụbọchị ahụ.