Esta 3

Nʼọnwa mbụ, nke bụ ọnwa Nisan, nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị eze Ahasuerọs. Ha fere nza (nke bụ Pua) nʼihu Heman iji họpụta ụbọchị na ọnwa. Ma nza ahụ danyere nʼụbọchị nke iri na atọ nʼọnwa nke iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada.

Esther 3:7 (UKJV) In the first month, that is, the month Nisan, in the twelfth year of king Ahasuerus, they cast Pur, that is, the lot, before Haman from day to day, and from month to month, to the twelfth month, that is, the month Adar.

5Ihe a were Heman iwe nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na Mọdekai jụrụ igbu ikpere nʼihu ya, maọbụ ịsọpụrụ ya.

6Mgbe ọ matara ndị Mọdekai ha bụ, ọ dị ya ka ihe ileda anya ma o gbuo naanị Mọdekai. Kama Heman chọrọ ụzọ ọ ga-esi laa ndị Mọdekai niile, bụ ndị Juu nọ nʼalaeze niile nke Sekses nʼiyi.

7Nʼọnwa mbụ, nke bụ ọnwa Nisan, nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị eze Ahasuerọs. Ha fere nza (nke bụ Pua) nʼihu Heman iji họpụta ụbọchị na ọnwa. Ma nza ahụ danyere nʼụbọchị nke iri na atọ nʼọnwa nke iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada.

8Mgbe ahụ Heman sịrị eze Sekses, “O nwere otu ndị gbasara ebe niile, nʼetiti ndị bi nʼobodo dị iche iche niile nke alaeze gị, ha kepụrụ onwe ha iche. Iwu ha dị iche site nʼiwu nke ndị mba ọzọ. Ha adịghị edebekwa iwu eze, ọ gaghị abara eze uru i hapụ ha ka ha nọdụrụ onwe ha.

9Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ya nye iwu ka a laa ha nʼiyi, aga m akwụnye puku talenti ọlaọcha iri nʼaka ndị nlekọta nʼihi ụlọakụ eze.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.