12Mgbe ha gwara Mọdekai ihe Esta zara,
13o zighachiri ọsịsa a, “Echela nʼihi na i bi nʼụlọeze na naanị gị ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị Juu niile.
14Ọ bụrụ na ị gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?”
15Mgbe ahụ, Esta zara Mọdekai sị;
16“Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!”