Esta 4

Hatak jere nʼama obodo ahụ ebe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ụlọeze.

Esther 4:6 (UKJV) So Hatach went forth to Mordecai unto the street of the city, which was before the king's gate.

4Mgbe ụmụ agbọghọ na ndị onozi Esta gwara ya ihe banyere Mọdekai, o wutere ya nke ukwuu. O zigaara Mọdekai uwe, ka o nwee ike gbanwee uwe mkpe ahụ o yi, ma ọ naraghị ha.

5Mgbe ahụ, Esta ziri ka a kpọọ Hatak, otu nʼime ndị onozi eze, onye nke ọ bụ ọrụ ya ijere Esta ozi, gwa ya ka o jekwuru Mọdekai jụọ ya ihe kpatara nke a, na ihe mere o ji na-eme otu a.

6Hatak jere nʼama obodo ahụ ebe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ụlọeze.

7Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi.

8O nyekwara ya akwụkwọ iwu eze ebe e dere maka ịla ha nʼiyi, bụ nke akpọsara na Susa, ka o gosi ya Esta, kọwaakwa ya nye ya. Ọ gwara ya ka o nye ya iwu ka ọ bakwuru eze rịọ ya arịrịọ amara, rịọkwa ya ebere nʼihi ndị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.