5Mgbe ahụ, Esta ziri ka a kpọọ Hatak, otu nʼime ndị onozi eze, onye nke ọ bụ ọrụ ya ijere Esta ozi, gwa ya ka o jekwuru Mọdekai jụọ ya ihe kpatara nke a, na ihe mere o ji na-eme otu a.
6Hatak jere nʼama obodo ahụ ebe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ụlọeze.
7Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi.
8O nyekwara ya akwụkwọ iwu eze ebe e dere maka ịla ha nʼiyi, bụ nke akpọsara na Susa, ka o gosi ya Esta, kọwaakwa ya nye ya. Ọ gwara ya ka o nye ya iwu ka ọ bakwuru eze rịọ ya arịrịọ amara, rịọkwa ya ebere nʼihi ndị ya.
9Hatak lọghachiri zie Esta ihe niile Mọdekai kwuru.