2Mgbe ọ hụrụ Esta bụ nwunye eze ka o na-eguzo nʼogige ahụ, ihe ya masịrị ya, ọ nabatakwara ya site na ị setịpụrụ ya mkpara ọlaedo nke dị nʼaka ya. Ya mere, Esta bịaruru nso metụkwa isi mkpara ọlaedo ahụ aka.
3Eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ, eze nwanyị Esta? Gịnị bụ mkpa gị? Aga m emere gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ inye gị otu ọkara alaeze m.”
4Esta zara sị, “Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, achọrọ m ka gị na Heman bịa rie oriri m kwadooro unu taa.”
5Eze tụgharịrị gwa ndị ozi ya sị, “Gwanụ Heman ka o mee ngwangwa bịa ka anyị gaa mee ihe Esta rịọrọ.” Emesịa, eze na Heman bịara nʼoriri Esta.
6Mgbe ha na-aṅụ mmanya, eze sịrị Esta, “Ugbu a, gwa m ihe ị chọrọ, aga m enye gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ otu ọkara alaeze m.”