Esta 6

ọ kọọrọ Zeresh nwunye ya, na ndị enyi ya niile ihe niile nke mere ya. Ndị ndụmọdụ ya na nwunye ya Zeresh sịrị ya, “Ebe ọ bụ na Mọdekai, onye ị bidoro ịda nʼihu ya, bụ onye Juu, ị gaghị enwe ike emegide ya, ị ghaghị ịla nʼiyi.”

Esther 6:13 (UKJV) And Haman told Zeresh his wife and all his friends every thing that had befallen him. Then said his wise men and Zeresh his wife unto him, If Mordecai be of the seed of the Jews, before whom you have begun to fall, you shall not prevail against him, but shall surely fall before him.

11Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.”

12Emesịa, Mọdekai lọghachiri nʼọnụ ụzọ ama eze. Ma Heman mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, kpuchiekwa isi ya nʼiru ụjụ,

13ọ kọọrọ Zeresh nwunye ya, na ndị enyi ya niile ihe niile nke mere ya. Ndị ndụmọdụ ya na nwunye ya Zeresh sịrị ya, “Ebe ọ bụ na Mọdekai, onye ị bidoro ịda nʼihu ya, bụ onye Juu, ị gaghị enwe ike emegide ya, ị ghaghị ịla nʼiyi.”

14Mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, ndị onozi eze bịaruru duru Heman ngwangwa maka ịga nʼoriri ahụ Esta kwadoro.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.