10ha bụkwa ụmụ ndị ikom iri Heman nwa Hamedata, onye iro ndị Juu mụtara. Ma ha emetụghị akụnụba ha aka.
11Nʼụbọchị ahụ, a gwara eze ọnụọgụgụ ndị e gburu nʼobodo Susa.
12Eze sịrị Esta bụ nwunye eze, “Ndị Juu egbuola narị mmadụ ise nʼobodo Susa, gbukwaa ụmụ ndị ikom Heman iri. Ebe ha mere otu a nʼebe a, onye ma ihe ha mere nʼobodo dị iche iche nʼalaeze m? Ugbu a, gịnị ọzọ bụ arịrịọ gị? A ga-emezuru gị ya. Gịnị ọzọ bụ ihe ị chọrọ? A ga-emekwa ya.”
13Esta sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka ndị Juu bi na Susa meekwa ihe ha mere taa echi, ka a kwụbakwa ụmụ ndị ikom iri Heman nʼelu osisi.”
14Ya mere, eze kwenyere, a kụkwara ya dịka ekwe na Susa, a kwụbara ụmụ iri Heman nʼelu osisi.