Esta 9

Ma ndị Juu ndị ọzọ bi nʼobodo ndị ọzọ dị iche iche eze na-achị, jikọtakwara onwe ha ọnụ ịzọ ndụ ha, site otu a nwere onwe ha pụọ nʼaka ndị iro ha. Ha gburu iri puku mmadụ asaa na ise bụ ndị kpọrọ ha asị, ma ha emetụghị akụnụba ha aka.

Esther 9:16 (UKJV) But the other Jews that were in the king's provinces gathered themselves together, and stood for their lives, and had rest from their enemies, and slew of their foes seventy and five thousand, but they laid not their hands on the prey,

14Ya mere, eze kwenyere, a kụkwara ya dịka ekwe na Susa, a kwụbara ụmụ iri Heman nʼelu osisi.

15Ndị Juu bi na Susa chịkọtakwara onwe ha ọnụ nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa Ada, gbuo narị mmadụ atọ ọzọ nʼobodo Susa. Ma ha emetụghị akụnụba ndị ahụ aka.

16Ma ndị Juu ndị ọzọ bi nʼobodo ndị ọzọ dị iche iche eze na-achị, jikọtakwara onwe ha ọnụ ịzọ ndụ ha, site otu a nwere onwe ha pụọ nʼaka ndị iro ha. Ha gburu iri puku mmadụ asaa na ise bụ ndị kpọrọ ha asị, ma ha emetụghị akụnụba ha aka.

17E mere ihe ndị a nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada, ha zukwara ike nʼụbọchị so ya bụ abalị iri na anọ. Ha mere ụbọchị ahụ, ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ.

18Ma ndị Juu nọ na Susa zukọtara nʼụbọchị nke iri na atọ, na nʼụbọchị nke iri na anọ. Emesịa, nʼụbọchị nke iri na ise ha zuru ike, mekwa ya ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.