Esta 9

Nke a bụ iji gosi mgbe ndị Juu nweere onwe ha site nʼaka ndị iro ha, na iji cheta mgbe iru ụjụ ha ghọrọ ọṅụ, na mgbe ịkwa akwa ha ghọrọ ụbọchị mmemme ọṅụ. O deere ha ka ha debe ụbọchị ndị a dịka ụbọchị mmemme ọṅụ na oriri na ọṅụṅụ, na inyerịta onwe ha onyinye ihe oriri na inye ụmụ ogbenye onyinye dị iche iche.

Esther 9:22 (UKJV) As the days wherein the Jews rested from their enemies, and the month which was turned unto them from sorrow to joy, and from mourning into a good day: that they should make them days of feasting and joy, and of sending portions one to another, and gifts to the poor.

20Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya,

21ka ha na-eme mmemme a kwa afọ nʼụbọchị nke iri na anọ na nke iri na ise nke ọnwa Ada ọbụla.

22Nke a bụ iji gosi mgbe ndị Juu nweere onwe ha site nʼaka ndị iro ha, na iji cheta mgbe iru ụjụ ha ghọrọ ọṅụ, na mgbe ịkwa akwa ha ghọrọ ụbọchị mmemme ọṅụ. O deere ha ka ha debe ụbọchị ndị a dịka ụbọchị mmemme ọṅụ na oriri na ọṅụṅụ, na inyerịta onwe ha onyinye ihe oriri na inye ụmụ ogbenye onyinye dị iche iche.

23Ya mere, ndị Juu kwenyere ịga nʼihu ime mmemme a nke ha malitere ime, dịka Mọdekai si deere ha ya,

24nʼihi na Heman nwa Hamedata, onye Agag, onye iro ndị Juu niile, kpebiri ịla ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ ọ tụpụtara site nʼife nza.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.