23Ya mere, ndị Juu kwenyere ịga nʼihu ime mmemme a nke ha malitere ime, dịka Mọdekai si deere ha ya,
24nʼihi na Heman nwa Hamedata, onye Agag, onye iro ndị Juu niile, kpebiri ịla ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ ọ tụpụtara site nʼife nza.
25Mgbe izu ọjọọ a ruru eze ntị, o nyere iwu nke e debanyere nʼakwụkwọ sị, ka echiche ọjọọ nke Heman megide ndị Juu tụgharịa nʼisi ya, ọ kwukwara ka akwụgbuo ya na ụmụ ndị ikom niile nʼelu osisi.
26Ya mere, a kpọrọ ụbọchị ndị ahụ Purim nke sitere na mkpụrụ okwu Pur. Nʼihi ihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ na nke ha hụkwara na nke mekwaara ha.
27Ndị Juu niile kwekọrịtara idebe mmemme a, na imekwa ka ụmụ ha, na ndị niile kwenyere iso ha, na-emekwa ya. Ha kpebiri na ha ga-edebe ụbọchị abụọ ndị ahụ kwa afọ, nʼụzọ nakwa oge e zubere ka ọ bụrụ.