25Mgbe izu ọjọọ a ruru eze ntị, o nyere iwu nke e debanyere nʼakwụkwọ sị, ka echiche ọjọọ nke Heman megide ndị Juu tụgharịa nʼisi ya, ọ kwukwara ka akwụgbuo ya na ụmụ ndị ikom niile nʼelu osisi.
26Ya mere, a kpọrọ ụbọchị ndị ahụ Purim nke sitere na mkpụrụ okwu Pur. Nʼihi ihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ na nke ha hụkwara na nke mekwaara ha.
27Ndị Juu niile kwekọrịtara idebe mmemme a, na imekwa ka ụmụ ha, na ndị niile kwenyere iso ha, na-emekwa ya. Ha kpebiri na ha ga-edebe ụbọchị abụọ ndị ahụ kwa afọ, nʼụzọ nakwa oge e zubere ka ọ bụrụ.
28Aga na-echeta ụbọchị ndị a, na-eme kwa ya nʼọgbọ niile ọbụla, nʼezinaụlọ ọbụla, nʼala ọbụla a na-achị nakwa obodo ọbụla. Ndị Juu aghaghị idebe mmemme ụbọchị Purim, ma ọ bụkwanụ ncheta ụbọchị ndị a apụọ nʼobi ọgbọ ha niile.
29Nʼoge a, Esta nwunye eze, nwa Abihail, na Mọdekai onye Juu jikọtara aka dee akwụkwọ ọzọ nke e ji mesie akwụkwọ ahụ Mọdekai dere ike, maka ịmalite mmemme Purim.