2Ndị Juu chịkọtara onwe ha ọnụ nʼobodo niile dị nʼalaeze eze Sekses, maka ịzọ ndụ ha. Ma o nweghị onye ọbụla pụrụ imegide ha, nʼihi na egwu ha dakwasịrị ndị obodo niile dị iche iche.
3Ndịisi ọchịchị obodo niile, ndị na-anọchite anya eze, na ndịisi, na ndị ozi eze, nyeere ndị Juu aka, nʼihi na ha tụrụ egwu Mọdekai.
4Nʼihi na Mọdekai bụ onye a ma ama nʼụlọeze, ọ bụkwa onye a maara aha ya nʼalaeze ahụ niile, nʼihi na ike ọchịchị ya na-abawanye ụba karịa ụbọchị niile.
5Nke a mere, na ndị Juu ji mma agha gbuo, ma bibie ndị iro ha niile. Ha mesoro ndị kpọrọ ha asị mmeso ọbụla masịrị ha.
6Nʼime obodo ahụ e wusiri ike bụ Susa, ndị Juu gburu narị ndị ikom ise laa ha nʼiyi.