Esta 9

Ndịisi ọchịchị obodo niile, ndị na-anọchite anya eze, na ndịisi, na ndị ozi eze, nyeere ndị Juu aka, nʼihi na ha tụrụ egwu Mọdekai.

Esther 9:3 (UKJV) And all the rulers of the provinces, and the lieutenants, and the deputies, and officers of the king, helped the Jews; because the fear of Mordecai fell upon them.

1Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Ada, bụ ụbọchị a gaara emezu iwu ahụ eze nyere. Nʼụbọchị a, ndị iro ndị Juu lere anya na ha ga-ekpochapụ ha. Ma ugbu a, a tụgharịala iwu ahụ, mee ya ka ọ bụrụ ihe megidere ndị ahụ kpọrọ ndị Juu asị.

2Ndị Juu chịkọtara onwe ha ọnụ nʼobodo niile dị nʼalaeze eze Sekses, maka ịzọ ndụ ha. Ma o nweghị onye ọbụla pụrụ imegide ha, nʼihi na egwu ha dakwasịrị ndị obodo niile dị iche iche.

3Ndịisi ọchịchị obodo niile, ndị na-anọchite anya eze, na ndịisi, na ndị ozi eze, nyeere ndị Juu aka, nʼihi na ha tụrụ egwu Mọdekai.

4Nʼihi na Mọdekai bụ onye a ma ama nʼụlọeze, ọ bụkwa onye a maara aha ya nʼalaeze ahụ niile, nʼihi na ike ọchịchị ya na-abawanye ụba karịa ụbọchị niile.

5Nke a mere, na ndị Juu ji mma agha gbuo, ma bibie ndị iro ha niile. Ha mesoro ndị kpọrọ ha asị mmeso ọbụla masịrị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.