9ọ sịrị ndị ya, “Lee, ndị Izrel abaala ụba nke ukwuu nʼọnụọgụgụ dịkwa ike karịa anyị.
10Ngwanụ, ka anyị were amamihe meso ha mmeso ọjọọ, ma ọ bụghị otu a, ha ga-amụba karịa, mgbe agha ga-adapụta nʼetiti anyị na ndị iro anyị, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha, site nʼala a gbapụ.”
11Nʼihi nke a, ha tinyere ndịisi ohu ga na eledo ha, bụ ndị ga-eji ọrụ mmanye kpagbuo ha. Ha wuuru Fero obodo Payitọm na Ramesis, ebe ọ na-echekwa ihe.
12Ma dịka a na-ata ụmụ Izrel ahụhụ na-eleghị anya nʼazụ, otu a kwa ka ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba nʼọnụọgụgụ na-agbasakwa. Nke a mere ka ndị Ijipt tụọ ndị Izrel egwu.
13Ha ji oke ọrụ mekpaa ụmụ Izrel ahụ nke ukwuu,