Ọpụpụ 1

Mgbe ahụ kwa, eze Ijipt gwara ndị inyom Hibru na-aghọ nwa, ndị aha ha bụ Shifra na Pua sị,

Exodus 1:15 (UKJV) And the king of Egypt spoke to the Hebrew midwives, of which the name of the one was Shiphrah, and the name of the other Puah:

13Ha ji oke ọrụ mekpaa ụmụ Izrel ahụ nke ukwuu,

14mee ka ndụ ụmụ Izrel bụrụ ndụ jupụtara nʼihe ilu. Ha nyere ha ọrụ ike nke ịkpụ brik na ụrọ, tinyere ọrụ dị iche iche nʼubi ha. Nʼime ọrụ niile ha na-arụ, ndị Ijipt mesiri ha ike nke ukwuu.

15Mgbe ahụ kwa, eze Ijipt gwara ndị inyom Hibru na-aghọ nwa, ndị aha ha bụ Shifra na Pua sị,

16“Mgbe ọbụla unu na-aghọ nwa ndị inyom Hibru, unu lezie anya nʼokwute e ji amụ nwa, ọ bụrụ nwoke, gbuonụ ya, ma ọ bụrụkwanụ nwanyị, hapụnụ ya ka ọ dịrị ndụ.”

17Ma ndị inyom ndị a na-aghọ nwa emeghị ihe eze Ijipt gwara ha, nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke. Kama ha hapụrụ ụmụ ndị ikom ndị a ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.