Ọpụpụ 1

Ma ndị inyom ndị a na-aghọ nwa emeghị ihe eze Ijipt gwara ha, nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke. Kama ha hapụrụ ụmụ ndị ikom ndị a ndụ.

Exodus 1:17 (UKJV) But the midwives feared God, and did not as the king of Egypt commanded them, but saved the men children alive.

15Mgbe ahụ kwa, eze Ijipt gwara ndị inyom Hibru na-aghọ nwa, ndị aha ha bụ Shifra na Pua sị,

16“Mgbe ọbụla unu na-aghọ nwa ndị inyom Hibru, unu lezie anya nʼokwute e ji amụ nwa, ọ bụrụ nwoke, gbuonụ ya, ma ọ bụrụkwanụ nwanyị, hapụnụ ya ka ọ dịrị ndụ.”

17Ma ndị inyom ndị a na-aghọ nwa emeghị ihe eze Ijipt gwara ha, nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke. Kama ha hapụrụ ụmụ ndị ikom ndị a ndụ.

18Emesịa, eze Ijipt kpọrọ ndị inyom abụọ ahụ jụọ ha sị, “Gịnị mere unu ji nupu isi nʼiwu m nyere unu site nʼịhapụ igbu ụmụntakịrị ndị ikom Hibru a mụrụ, dịka m gwara unu?”

19Ndị inyom ahụ zara Fero sị, “Ndị inyom Hibru na-adị ike karịa ndị inyom Ijipt nʼịmụ nwa. Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.