Ọpụpụ 1

Ma ihe gaara ụmụ ụmụ Izrel nke ọma, ha mụbara, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụta ala ahụ niile.

Exodus 1:7 (UKJV) And the children of Israel were fruitful, and increased abundantly, and multiplied, and waxed exceeding mighty; and the land was filled with them.

5Ọnụọgụgụ ụmụ Jekọb ndị sooro ya gaa biri nʼIjipt dị iri mmadụ asaa. Ma Josef nọrịị nʼIjipt.

6Emesịa, Josef na ụmụnne ya niile nwụrụ, ma ọgbọ ahụ niile nwụkwara.

7Ma ihe gaara ụmụ ụmụ Izrel nke ọma, ha mụbara, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụta ala ahụ niile.

8Ma mgbe eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị ọchịchị nʼala Ijipt,

9ọ sịrị ndị ya, “Lee, ndị Izrel abaala ụba nke ukwuu nʼọnụọgụgụ dịkwa ike karịa anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.