16Na-atụfughị oge, Fero ziri ozi ka a kpọọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Emehiela m megide unu na Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
17Biko gbagharakwa m mmehie nke a, ma rịọọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka o wepụrụ m ọnwụ nke a. Ekwere m nkwa na agaghị m ajụkwa ọzọ ka unu laa.”
18Mosis hapụrụ Fero pụọ gaa kpeere Onyenwe anyị ekpere.
19Ngwangwa, Onyenwe anyị zitere ikuku nke si nʼebe anyanwụ na-ada bịa, nke bupụrụ igurube ndị ahụ site nʼala Ijipt, buba ha nʼOsimiri Uhie. Ọ dịkwaghị otu igurube fọdụrụ nʼala Ijipt niile.
20Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, o kweghị ka ụmụ Izrel gaa fee Chineke ofufe.