14Ha niile kpuchichara ala Ijipt niile, site nʼotu akụkụ ruo nʼakụkụ nke ọzọ. Nke a bụ mbata igurube kachasị ibe ya njọ nʼIjipt. Ijipt agaghị enwekwa nke dịka ya ọzọ.
15Ha kpuchiri ala niile ruo mgbe ọchịchịrị gbachiri ya. Ha richapụrụ ihe niile na-eto nʼubi, na mkpụrụ niile na-amị nʼosisi, bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ukwu ahụ hapụrụ. Nʼikpeazụ, ọ dịghị ahịhịa ndụ fọdụrụ nʼala ma nʼelu osisi nʼIjipt niile.
16Na-atụfughị oge, Fero ziri ozi ka a kpọọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Emehiela m megide unu na Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
17Biko gbagharakwa m mmehie nke a, ma rịọọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka o wepụrụ m ọnwụ nke a. Ekwere m nkwa na agaghị m ajụkwa ọzọ ka unu laa.”
18Mosis hapụrụ Fero pụọ gaa kpeere Onyenwe anyị ekpere.