Ọpụpụ 10

Ha niile kpuchichara ala Ijipt niile, site nʼotu akụkụ ruo nʼakụkụ nke ọzọ. Nke a bụ mbata igurube kachasị ibe ya njọ nʼIjipt. Ijipt agaghị enwekwa nke dịka ya ọzọ.

Exodus 10:14 (UKJV) And the locust went up over all the land of Egypt, and rested in all the coasts of Egypt: very grievous were they; before them there were no such locusts as they, neither after them shall be such.

12Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Setịpụ aka gị nʼala Ijipt ka igurube jupụta na ya, kpuchie ebe niile, richapụ ihe niile na-eto eto dị nʼala ahụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ hapụrụ.”

13Ya mere, Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼelu ala Ijipt, Onyenwe anyị mere ka ifufe nke si nʼebe anyanwụ si awa fee nʼụbọchị ahụ niile na abalị ahụ niile. Nʼụtụtụ ya, ifufe ahụ si nʼebe anyanwụ si awa bubatara igurube ndị ahụ.

14Ha niile kpuchichara ala Ijipt niile, site nʼotu akụkụ ruo nʼakụkụ nke ọzọ. Nke a bụ mbata igurube kachasị ibe ya njọ nʼIjipt. Ijipt agaghị enwekwa nke dịka ya ọzọ.

15Ha kpuchiri ala niile ruo mgbe ọchịchịrị gbachiri ya. Ha richapụrụ ihe niile na-eto nʼubi, na mkpụrụ niile na-amị nʼosisi, bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ukwu ahụ hapụrụ. Nʼikpeazụ, ọ dịghị ahịhịa ndụ fọdụrụ nʼala ma nʼelu osisi nʼIjipt niile.

16Na-atụfughị oge, Fero ziri ozi ka a kpọọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Emehiela m megide unu na Onyenwe anyị bụ Chineke unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.